60Ị hụla ịbọ ọbọ ha niile na nzube niile ha na-ezube megide m.
61Onyenwe anyị, ị nụla nkọcha niile ha na-akọcha m na nzube niile ha na-ezube megide m.
62Ị na-anụ izu na ntamu nke ndị iro m megide m ogologo ụbọchị niile.
63Lee ha! Ha na-akọcha m mgbe ha guzoro ọtọ, na-akọcha m mgbe ha nọdụrụ ala. Ha ji abụ na-akọcha m.
64Onyenwe anyị, biko, kwụghachi ha ihe ruuru ha, nʼihi ihe niile aka ha rụpụtara.