Abụ Akwa 3

Ọ gbachibidola m ogige, ime ka m ghara ịgbapụ; o jirila ụdọ igwe dị arọ mee ka m ghara ijegharị.

Lamentations 3:7 (UKJV) He has hedged me about, that I cannot get out: he has made my chain heavy.

5O busola m agha, jiri ihe ilu na oke mkpagbu gbaa m gburugburu.

6O meela ka m biri nʼọchịchịrị dịka ndị nwụrụ anwụ kemgbe oge gara aga.

7Ọ gbachibidola m ogige, ime ka m ghara ịgbapụ; o jirila ụdọ igwe dị arọ mee ka m ghara ijegharị.

8Ọ na-eme ka ekpere m hapụ irute ya, ọ bụladị mgbe m kpọkuru ya ka o nyere m aka.

9O jirila nkume a wara awa gbachie ụzọ m niile, o meela ka okporoụzọ m gbagọọ agbagọ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.