10Aka ha ka ndị inyom ndị ahụ nwere obi ebere ji gbuo ụmụ ha, sie ha. Ụmụ ha ghọọrọ ha nri nʼoge ahụ a lara ndị m nʼiyi.
11Onyenwe anyị emeela ka nrubiga oke nke iwe ya pụta ìhè; ọ wụpụla iwe ya dị ọkụ. O sunyela ọkụ na Zayọn, nke rechapụrụ ntọala ya niile.
12Ndị eze nke ụwa ekwetaghị; otu a kwa, ndị ụwa niile ekwetakwaghị na ndị iro nwere ike si nʼọnụ ụzọ ama banye nʼime Jerusalem.
13Ma ihe ndị a mere nʼihi mmehie ndị amụma ya, na nʼihi ajọ omume nke ndị nchụaja ya, ndị wụsiri ọbara ndị ezi omume nọ nʼetiti ya.
14Ugbu a, ha na-asọ isi nʼokporoụzọ niile, dịka ndị kpuru ìsì. Ha ejirila ọbara merụọ onwe ha. O nwekwaghị onye na-agbalị ịbịaru ha nso ịmetụ uwe ha aka.