12Ndị eze nke ụwa ekwetaghị; otu a kwa, ndị ụwa niile ekwetakwaghị na ndị iro nwere ike si nʼọnụ ụzọ ama banye nʼime Jerusalem.
13Ma ihe ndị a mere nʼihi mmehie ndị amụma ya, na nʼihi ajọ omume nke ndị nchụaja ya, ndị wụsiri ọbara ndị ezi omume nọ nʼetiti ya.
14Ugbu a, ha na-asọ isi nʼokporoụzọ niile, dịka ndị kpuru ìsì. Ha ejirila ọbara merụọ onwe ha. O nwekwaghị onye na-agbalị ịbịaru ha nso ịmetụ uwe ha aka.
15Ndị mmadụ na-eti mkpu na-asị ha, “Sitenụ nʼebe anyị nọ wezuga onwe unu! Unu rụrụ arụ! Wezuganụ onwe unu, unu emetụkwala anyị aka!” Mgbe ha gbapụrụ ọsọ bido na-awagharị, ndị nọ na mba dị iche iche na-asị ha, “O kwesighị ka ha nọrọkwa nʼebe a.”
16Onyenwe anyị nʼonwe ya achụsaala ha. Ọ gaghị agụnyekwa ha. Ọ dịkwaghị ndị na-asọpụrụ onye nchụaja, ọ dịkwaghị ndị na-emere ndị okenye amara.