Abụ Akwa 4

Ndị mmadụ na-esogharị anyị ebe niile anyị jere, nʼihi ya anyị enweghị ike jegharịakwa nʼokporoụzọ anyị. Ọgwụgwụ anyị adịla nso, a pụkwara ịgụta ụbọchị ole fọdụụrụ anyị, tupu ọgwụgwụ anyị eruo.

Lamentations 4:18 (UKJV) They hunt our steps, that we cannot go in our streets: our end is near, our days are fulfilled; for our end has come.

16Onyenwe anyị nʼonwe ya achụsaala ha. Ọ gaghị agụnyekwa ha. Ọ dịkwaghị ndị na-asọpụrụ onye nchụaja, ọ dịkwaghị ndị na-emere ndị okenye amara.

17Nke ka nke, anya agbaala anyị ọchịchịrị, ebe anyị nọ na-elepụ anya nʼefu maka enyemaka. Ọ bụ site nʼụlọ elu nche ka anyị nọ na-elepụ anya, na-ele anya maka ọbịbịa mba ahụ na-enweghị ike bịa zọpụta anyị.

18Ndị mmadụ na-esogharị anyị ebe niile anyị jere, nʼihi ya anyị enweghị ike jegharịakwa nʼokporoụzọ anyị. Ọgwụgwụ anyị adịla nso, a pụkwara ịgụta ụbọchị ole fọdụụrụ anyị, tupu ọgwụgwụ anyị eruo.

19Ndị na-achụ anyị ọsọ na-agbasi ọsọ ike karịa ugo na-efe na mbara eluigwe. Ha chụgharịrị anyị nʼelu ugwu niile, nọrọkwa nʼọzara zoo onwe ha na-eche anyị.

20Ume ndụ anyị, nke Onyenwe anyị tere mmanụ, ka ha jidere nʼọnya ha. Anyị naara eche na anyị ga-ebi nʼokpuru ndo ya, nʼetiti mba dị iche iche.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.