18Ndị mmadụ na-esogharị anyị ebe niile anyị jere, nʼihi ya anyị enweghị ike jegharịakwa nʼokporoụzọ anyị. Ọgwụgwụ anyị adịla nso, a pụkwara ịgụta ụbọchị ole fọdụụrụ anyị, tupu ọgwụgwụ anyị eruo.
19Ndị na-achụ anyị ọsọ na-agbasi ọsọ ike karịa ugo na-efe na mbara eluigwe. Ha chụgharịrị anyị nʼelu ugwu niile, nọrọkwa nʼọzara zoo onwe ha na-eche anyị.
20Ume ndụ anyị, nke Onyenwe anyị tere mmanụ, ka ha jidere nʼọnya ha. Anyị naara eche na anyị ga-ebi nʼokpuru ndo ya, nʼetiti mba dị iche iche.
21Ṅụrịa ọṅụ, ka obi tọkwaa gị ụtọ, gị ada Edọm, onye nke bi nʼala Uz. Ma a ga-emesịakwa nye gị iko ahụ. Ị ga-esitekwa na ya ṅụọ ihe ọṅụṅụ ṅụjụbiga afọ oke. A ga-agbakwa gị ọtọ.
22Gị ada Zayọn, ahụhụ gị agwụsịala; Ọ gaghị emekwa ka i jee biri ogologo oge na mba ọzọ. Kama, ọ ga-ata gị ahụhụ nʼihi mmehie gị, gị, ada Edọm, kpugheekwa ajọ omume gị niile.