4Lee na ire nwa ọhụrụ na-arapara nʼakpo ọnụ ya nʼihi akpịrị ịkpọ nkụ. Ụmụntakịrị na-arịọkwa ka e nye ha nri, ma o nweghị onye na-enye ha nri ahụ.
5Ndị ahụ naara eri ihe ụtọ dị iche iche tọgbọrọ nʼefu ugbu a nʼokporoụzọ. Ndị ahụ a zụrụ iyi uwe uhie uhie nọ ugbu a na-edina nʼebe a na-ekpofu ahịhịa.
6Ahụhụ dịịrị ndị m dị ukwuu karịa ahụhụ nke bịakwasịrị Sọdọm. Nʼihi na ọ bụ nʼotu ntabi anya ka a kwatụrụ ya. Ọ dịkwaghị onye bịara nyere ya aka.
7Ụmụ ndị eze ha na-egbuke karịa akụmmiri igwe, ha na-acha ọcha chakarịa mmiri ara ehi. Anụ ahụ ha na-akwọ mụrụmụrụ dịka nkume rubi dị oke ọnụahịa; ha makwara mma ile anya dịka nkume safaia, bụ nkume dị oke ọnụahịa.
8Ma ugbu a, ha na-eji nji karịa unyi. A naghị amatakwa ha ma a hụ ha nʼezi. Anụ ahụ ha araparala nʼọkpụkpụ ha; ọ kpọnwụọla dịka a ga-asị na ọ bụ osisi kpọrọ nkụ.