7Ụmụ ndị eze ha na-egbuke karịa akụmmiri igwe, ha na-acha ọcha chakarịa mmiri ara ehi. Anụ ahụ ha na-akwọ mụrụmụrụ dịka nkume rubi dị oke ọnụahịa; ha makwara mma ile anya dịka nkume safaia, bụ nkume dị oke ọnụahịa.
8Ma ugbu a, ha na-eji nji karịa unyi. A naghị amatakwa ha ma a hụ ha nʼezi. Anụ ahụ ha araparala nʼọkpụkpụ ha; ọ kpọnwụọla dịka a ga-asị na ọ bụ osisi kpọrọ nkụ.
9Ọnọdụ ndị e ji mma agha gbuo ka mma karịa ọnọdụ ndị nwụrụ site nʼụnwụ, ndị agụụ gụgburu, ndị ji nwayọọ nwayọọ nwụọ nʼihi nri nke na-adịghị nʼubi.
10Aka ha ka ndị inyom ndị ahụ nwere obi ebere ji gbuo ụmụ ha, sie ha. Ụmụ ha ghọọrọ ha nri nʼoge ahụ a lara ndị m nʼiyi.
11Onyenwe anyị emeela ka nrubiga oke nke iwe ya pụta ìhè; ọ wụpụla iwe ya dị ọkụ. O sunyela ọkụ na Zayọn, nke rechapụrụ ntọala ya niile.