12Mgbe nke a gasịrị, onye ahụ wetara ya, ga-abọ ya. Onye nchụaja ga-ewere akụkụ ya niile, na isi ya, na abụba ya tụkwasị ha nʼelu nkụ ahụ na-enwu ọkụ dị nʼebe ịchụ aja.
13Ma ihe ndị dị nʼime afọ ya, na ụkwụ ya, ka onye ahụ ga-asa mmiri, tupu onye nchụaja eweta ha niile kpọọ ha ọkụ nʼebe ịchụ aja. Ọ bụ onyinye aja nsure ọkụ, onyinye e nyere site nʼọkụ, nke isisi ya dị ezi ụtọ nye Onyenwe anyị.
14“ ‘Ọ bụrụ na onyinye ọ na-enye Onyenwe anyị dịka aja nsure ọkụ bụ site nʼụmụ anụ ufe, ọ ghaghị ịbụ nduru, maọbụ nwa kpalakwukwu.
15Onye nchụaja ga-ewebata anụ ufe ahụ nʼebe ịchụ aja, tụbipụ isi ya, wụsa ọbara ya nʼakụkụ ebe ịchụ aja.
16Ọ ga-ewepụ akpa nri ya, na ihe dị ya nʼime, tụnye ha nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ nke ebe ịchụ aja ahụ; ebe a na-ekposa ntụ.