3“ ‘Ọ bụrụ na ọ bụ onyinye aja nsure ọkụ e wetara site nʼigwe ehi, ọ bụ oke ehi nke na-enweghị ntụpọ ka ọ ga-eweta. Nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute ka ọ ga-eweta ya, ka ọ bụrụ ihe Onyenwe anyị ga-anabata.
4Onye ahụ wetara ya ga-ebikwasị aka ya nʼisi anụ aja nsure ọkụ ahụ, a ga-anabata ya maka iji kpuchie mmehie ya.
5Nwoke ahụ ga-egbu nwa oke ehi ahụ nʼihu Onyenwe anyị. Ụmụ ndị ikom Erọn, bụ ndị nchụaja ga-ewere ọbara ya fesa ya nʼakụkụ niile nke ebe ịchụ aja, nʼọnụ ụzọ e si abata ụlọ nzute ahụ.
6Ị ga-agba ehi aja nsure ọkụ ahụ akpụkpọ, bọkasịa ya ntakịrị ntakịrị.
7Ụmụ Erọn, ndị nchụaja ga-etinye ọkụ nʼebe ịchụ aja ahụ, doo nkụ nʼusoro nʼelu ya.