Levitikọs 10

Ebe ọ bụ na e webataghị ọbara ya nʼime Ebe Nsọ ahụ, unu gaara anọ nʼakụkụ ebe nsọ ahụ rie anụ ewu ahụ, dịka m nyere unu nʼiwu.”

Leviticus 10:18 (UKJV) Behold, the blood of it was not brought in within the holy place: all of you should indeed have eaten it in the holy place, as I commanded.

16Mgbe Mosis jụrụ ajụjụ banyere mkpi ahụ e ji chụọ aja mmehie, ọ chọpụtara na a kpọọla ya ọkụ. O wesoro Elieza na Itama ụmụ ndị ikom Erọn iwe sị ha,

17“Gịnị mere unu erighị anụ ahụ e ji chụọ aja mmehie nʼakụkụ ebe nsọ ahụ? Ọ bụ nke dịkarịsịrị nsọ; e nyere unu ya maka iwepụ ọmụma ikpe dịrị ọgbakọ Izrel, na ikpuchi mmehie ha nʼihu Onyenwe anyị.

18Ebe ọ bụ na e webataghị ọbara ya nʼime Ebe Nsọ ahụ, unu gaara anọ nʼakụkụ ebe nsọ ahụ rie anụ ewu ahụ, dịka m nyere unu nʼiwu.”

19Ma Erọn zara Mosis sị ya, “Lee, taa ka ha chụrụ aja mmehie na aja nsure ọkụ ha nʼihu Onyenwe anyị. Ma lee ụdị ihe dakwasịrị m. Ọ gaara atọ Onyenwe anyị ụtọ ma a sị na m riri anụ aja mmehie ndị a nʼụbọchị dị otu a?”

20Mgbe Mosis nụrụ nke a, o nwere afọ ojuju nʼihi ọsịsa Erọn nyere.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.