18okwukwu nwere mpi, okwolo na udele,
19ụgbala, utù dị iche iche, nnụnụ ọdụ nta na ụsụ.
20“ ‘Ụmụ ahụhụ niile na-efe efe nke na-aga ije nʼụkwụ anọ bụ ihe rụrụ arụ nye unu, unu agaghị eri ya.
21Ma e nwere ụfọdụ ụmụ ahụhụ na-efe efe nke na-aga ije nʼụkwụ anọ ndị unu nwere ike iri: ndị a bụ ndị nwere ogwe ụkwụ nke ha ji na-awụ awụ nʼala,
22ndị a ka unu ga-eri nʼetiti ha, igurube dị iche iche, na akpankwụ dị iche iche, na abụzụ dị iche iche, na ụkpana dị iche iche.