38Ma ọ bụrụ na e tinyere mmiri nʼelu mkpụrụ ọghịgha ndị ahụ, ozu adakwasị nʼelu ya, ha ga-abụ ihe rụrụ arụ.
39“ ‘Ọ bụrụ na anụmanụ unu kwesiri iri eri anwụọ, onye ahụ metụrụ ya aka ga-abụ onye rụrụ arụ ruo uhuruchi.
40Onye ọbụla riri ozu anụ ahụ, maọbụ bufuo ozu ya, ga-abụ onye rụrụ arụ ruo uhuruchi. Ọ ga-asa uwe ya mmiri.
41“ ‘Anụmanụ ọbụla na-akpụgharị nʼala bụ ihe rụrụ arụ nye unu. Unu erikwala ha.
42Unu agaghị eri anụmanụ ọbụla na-akpụgharị nʼala, ma ha na-akpụgharị nʼafọ ha, ma ha na-agagharị nʼụkwụ anọ, ma ha nwere ụkwụ dị ọtụtụ. Ha bụ ihe rụrụ arụ.