Levitikọs 11

Unu emetụkwala ozu ha aka maọbụ rie anụ ha, nʼihi na ha bụ ihe na-adịghị ọcha nye unu.

Leviticus 11:8 (UKJV) Of their flesh shall all of you not eat, and their carcass shall all of you not touch; they are unclean to you.

6Ewi nkume: Ọ na-atagharị nri ya, ma o nweghị ụkwụ wara njakpa. Ọ bụ anụ na-adịghị ọcha nye unu.

7Ezi: Ọ bụ nʼezie na ụkwụ ya wara njakpa ma ọ dịghị atagharị nri ya. Ọ bụ anụ na-adịghị ọcha nye unu.

8Unu emetụkwala ozu ha aka maọbụ rie anụ ha, nʼihi na ha bụ ihe na-adịghị ọcha nye unu.

9“ ‘Nʼime ihe niile e kere eke dị ndụ biri na mmiri, maọbụ nʼiyi nta na nʼoke osimiri, unu nwere ike iri ụdị ọbụla nwere ntu na akpịrịkpa nʼahụ ha.

10Ma unu ekwesighị iri ihe ọbụla nke na-enweghị ntu maọbụ akpịrịkpa, ma ha bụ anụ na-enupụta enupụta, maọbụ na ha so nʼanụ ndị ọzọ dị ndụ bi na mmiri, unu kwesiri ịsọ ha asọ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.