5Ewi: Ọ na-atagharị nri ya, ma o nweghị ụkwụ wara njakpa. Ọ bụ anụ na-adịghị ọcha nye unu.
6Ewi nkume: Ọ na-atagharị nri ya, ma o nweghị ụkwụ wara njakpa. Ọ bụ anụ na-adịghị ọcha nye unu.
7Ezi: Ọ bụ nʼezie na ụkwụ ya wara njakpa ma ọ dịghị atagharị nri ya. Ọ bụ anụ na-adịghị ọcha nye unu.
8Unu emetụkwala ozu ha aka maọbụ rie anụ ha, nʼihi na ha bụ ihe na-adịghị ọcha nye unu.
9“ ‘Nʼime ihe niile e kere eke dị ndụ biri na mmiri, maọbụ nʼiyi nta na nʼoke osimiri, unu nwere ike iri ụdị ọbụla nwere ntu na akpịrịkpa nʼahụ ha.