13onye nchụaja a ga-eleru ya anya, ọ bụrụ na ọrịa ahụ enupụtala nʼahụ ya niile, ọ ga-ekwupụta na onye ahụ dị ọcha, ebe ọ bụ na ọrịa ahụ enupụtala mee ka anụ ahụ ya chawa ọcha.
14Ma ọ bụrụ na e nwere akụkụ ahụ ya ọnya ọ hụrụ pụtara, ọ ga-agụ ya dịka onye na-adịghị ọcha.
15Onye nchụaja ga-enyocha ọnya ahụ. Kwupụta na onye ahụ rụrụ arụ. Ọnya ahụ rụrụ arụ nʼihi na ọrịa ekpenta ka ọ bụ.
16Ọ bụrụ nʼọnya ahụ agbanwe na-acha ọcha, ha ga-agakwuru onye nchụaja.
17Onye nchụaja ga-ele ya ahụ. Ọ bụrụ na ọnya niile ahụ na-acha ezi ọcha, onye nchụaja ga-agụ ya dịka onye na-enweghị ntụpọ. Ndị dị ọcha ka ha ga-abụ.