Levitikọs 13

“Ọ bụrụ na etuto toro mmadụ nʼahụ alaa,

Leviticus 13:18 (UKJV) The flesh also, in which, even in the skin thereof, was a boil, and is healed,

16Ọ bụrụ nʼọnya ahụ agbanwe na-acha ọcha, ha ga-agakwuru onye nchụaja.

17Onye nchụaja ga-ele ya ahụ. Ọ bụrụ na ọnya niile ahụ na-acha ezi ọcha, onye nchụaja ga-agụ ya dịka onye na-enweghị ntụpọ. Ndị dị ọcha ka ha ga-abụ.

18“Ọ bụrụ na etuto toro mmadụ nʼahụ alaa,

19ma akpụkpọ anụ ahụ ya anọgide na-acha ọcha, maọbụ na-acha ọbara ọbara, a ga-ejekwuru onye nchụaja ka o lee ya anya nʼahụ.

20Ọ bụrụ na onye nchụaja achọpụta na e nwere ọrịa dị nʼokpuru akpụkpọ ahụ ya, chọpụtakwa na ajị ya na-acha ọcha, onye nchụaja ga-agụ mmadụ ahụ dịka onye rụrụ arụ, nʼihi na ekpenta esitela nʼetuto ahụ pụta.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.