Levitikọs 13

“Ọ bụrụ na ọkụ agbaa mmadụ, mee ka ọnya pụta ya nʼahụ: ọ bụrụ na ọnya ahụ ebido na-acha ọbara ọbara, maọbụ na-acha ezigbo ọcha,

Leviticus 13:24 (UKJV) Or if there be any flesh, in the skin whereof there is a hot burning, and the quick flesh that burns have a white bright spot, somewhat reddish, or white;

22Nʼime ụbọchị asaa ahụ, ọ bụrụ na ọnya ahụ abaa ụba karịa ka ọ dị na mbụ, onye nchụaja ga-agụ mmadụ ahụ dịka onye na-adịghị ọcha. Ọ bụ ọrịa na-emerụ emerụ ka ọ bụ.

23Ma ọ bụrụ na ọ baghị ụba karịa, onye nchụaja ga-agụ mmadụ ahụ dịka onye dị ọcha, nʼihi na ihe a bụ etuto lara ala.

24“Ọ bụrụ na ọkụ agbaa mmadụ, mee ka ọnya pụta ya nʼahụ: ọ bụrụ na ọnya ahụ ebido na-acha ọbara ọbara, maọbụ na-acha ezigbo ọcha,

25onye nchụaja ga-elezi onye dị otu a anya. Ọ bụrụ na ajị dị gburugburu ebe ọnya ahụ dị na-acha ọcha, maọbụ na ọnya ahụ mibara ime karịa, ọ ghọọla ekpenta nke si nʼọnya ahụ nupụta. Onye nchụaja ga-agụ mmadụ ahụ dịka onye na-adịghị ọcha. Ọ bụ ọrịa ekpenta.

26Ma ọ bụrụ na onye nchụaja elee ya hụ na ajị dị gburugburu ebe ahụ adịghị ọcha, ọ bụrụkwa na ọ dịghị ala karịa akpụkpọ ahụ, na ọ na-aṅacha, mgbe ahụ onye nchụaja ga-edebe onye ahụ iche ụbọchị asaa.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.