21Ọ bụrụ na onye nchụaja achọpụta na ajị ọcha adịghị nʼakpụkpọ ahụ ya, chọpụtakwa na ọnya ahụ abanyeghị nʼime, onye nchụaja ga-edebe onye ahụ ụbọchị asaa.
22Nʼime ụbọchị asaa ahụ, ọ bụrụ na ọnya ahụ abaa ụba karịa ka ọ dị na mbụ, onye nchụaja ga-agụ mmadụ ahụ dịka onye na-adịghị ọcha. Ọ bụ ọrịa na-emerụ emerụ ka ọ bụ.
23Ma ọ bụrụ na ọ baghị ụba karịa, onye nchụaja ga-agụ mmadụ ahụ dịka onye dị ọcha, nʼihi na ihe a bụ etuto lara ala.
24“Ọ bụrụ na ọkụ agbaa mmadụ, mee ka ọnya pụta ya nʼahụ: ọ bụrụ na ọnya ahụ ebido na-acha ọbara ọbara, maọbụ na-acha ezigbo ọcha,
25onye nchụaja ga-elezi onye dị otu a anya. Ọ bụrụ na ajị dị gburugburu ebe ọnya ahụ dị na-acha ọcha, maọbụ na ọnya ahụ mibara ime karịa, ọ ghọọla ekpenta nke si nʼọnya ahụ nupụta. Onye nchụaja ga-agụ mmadụ ahụ dịka onye na-adịghị ọcha. Ọ bụ ọrịa ekpenta.