Levitikọs 13

“Ọ bụrụ na nwoke maọbụ nwanyị ọbụla enwee ọnya nʼisi, maọbụ na nti ya,

Leviticus 13:29 (UKJV) If a man or woman have a plague upon the head or the beard;

27Nʼụbọchị nke asaa, onye nchụaja ga-elezi onye ahụ anya nke ọma. Ọ bụrụ na ọ chọpụtara na ọnya ahụ na-abasaa nʼakpụkpọ ahụ ya, onye nchụaja ga-agụ onye ahụ dịka onye na-adịghị ọcha. Ọrịa na-emerụ emerụ ka ọ bụ.

28Ma ọ bụrụ na ọ gbanweghị, bụrụkwa na ọ basaghị nʼakpụkpọ ahụ ma ọ na-aṅacha, ọ bụ ihe ọzịza sitere nʼọkụ rere onye ahụ, onye nchụaja ga-agụ ya dịka onye dị ọcha, nʼihi na ọ bụ apa ọnya lara ala.

29“Ọ bụrụ na nwoke maọbụ nwanyị ọbụla enwee ọnya nʼisi, maọbụ na nti ya,

30onye nchụaja ga-elezi ọnya ahụ anya. Ọ bụrụ na ọ dị ala karịa akpụkpọ ahụ ya, ọ bụrụkwa na ajị dị na ya na-acha odo odo dị irighiri, onye nchụaja ga-agụ ha dịka ndị na-adịghị ọcha. Ọ bụ ọrịa na-emerụ emerụ nke dị nʼisi maọbụ nʼagba.

31Ma ọ bụrụ na onye nchụaja achọpụta na ọnya ahụ adịghị abasa abasa, maọbụ na ajị dị nʼebe ahụ adịghị eji ojii, onye nchụaja ga-edebe onye ahụ ụbọchị asaa.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.