Levitikọs 13

Ma ọ bụrụ na onye nchụaja achọpụta na ọnya ahụ adịghị abasa abasa, maọbụ na ajị dị nʼebe ahụ adịghị eji ojii, onye nchụaja ga-edebe onye ahụ ụbọchị asaa.

Leviticus 13:31 (UKJV) And if the priest look on the plague of the scab, and, behold, it be not in sight deeper than the skin, and that there is no black hair in it; then the priest shall shut up him that has the plague of the scab seven days:

29“Ọ bụrụ na nwoke maọbụ nwanyị ọbụla enwee ọnya nʼisi, maọbụ na nti ya,

30onye nchụaja ga-elezi ọnya ahụ anya. Ọ bụrụ na ọ dị ala karịa akpụkpọ ahụ ya, ọ bụrụkwa na ajị dị na ya na-acha odo odo dị irighiri, onye nchụaja ga-agụ ha dịka ndị na-adịghị ọcha. Ọ bụ ọrịa na-emerụ emerụ nke dị nʼisi maọbụ nʼagba.

31Ma ọ bụrụ na onye nchụaja achọpụta na ọnya ahụ adịghị abasa abasa, maọbụ na ajị dị nʼebe ahụ adịghị eji ojii, onye nchụaja ga-edebe onye ahụ ụbọchị asaa.

32Nʼụbọchị nke asaa onye nchụaja ga-elezi ọnya ahụ anya. Ọ bụrụ na ọnya ahụ abasaghị karịa, ọ bụrụ na o nweghị ajị na-acha edo edo, ọ bụrụkwa na o mibaghị emiba,

33ọ ga-akpụchapụ ajị niile dị nʼakụkụ ebe ahụ ọnya mere ya, ma ọ gaghị akpụchapụ ajị dị nʼọnya ahụ nʼonwe ya. Onye nchụaja ga-edebe onye ahụ ụbọchị asaa.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.