Levitikọs 13

Onye nchụaja ga-ele ya anya. Ọ bụrụ na ọnya ahụ agbasaala nʼakpụkpọ ahụ ya, onye nchụaja a gaghị achọwa ajị na-acha edo edo. Onye ahụ rụrụ arụ.

Leviticus 13:36 (UKJV) Then the priest shall look on him: and, behold, if the scab be spread in the skin, the priest shall not seek for yellow hair; he is unclean.

34Nʼụbọchị nke asaa, onye nchụaja ga-elezi ọnya ahụ anya. Ọ bụrụ na ọ basaghị karịa, maọbụ mibanye nʼime karịa anụ ahụ, a ga-agụ mmadụ ahụ dịka onye dị ọcha. Ọ ga-apụ sachaa uwe ya, bụrụ onye dị ọcha.

35Ma ọ bụrụ na mgbe a gụchara ya nʼonye dị ọcha ọnya ahụ emesịa basaa nʼahụ ya.

36Onye nchụaja ga-ele ya anya. Ọ bụrụ na ọnya ahụ agbasaala nʼakpụkpọ ahụ ya, onye nchụaja a gaghị achọwa ajị na-acha edo edo. Onye ahụ rụrụ arụ.

37Ma ọ bụrụ nʼuche onye nchụaja na ọnya ahụ adịghị abasa abasa, ọ bụrụkwa na ajị ojii epupụtala nʼebe ahụ, ọnya ahụ alaala. Onye dị ọcha ka mmadụ ahụ bụ. Onye nchụaja ga-ekwupụta na ọ dị ọcha.

38“Mgbe nwoke maọbụ nwanyị ọbụla nwere ntụpọ ọcha nʼanụ ahụ ya,

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.