35Ma ọ bụrụ na mgbe a gụchara ya nʼonye dị ọcha ọnya ahụ emesịa basaa nʼahụ ya.
36Onye nchụaja ga-ele ya anya. Ọ bụrụ na ọnya ahụ agbasaala nʼakpụkpọ ahụ ya, onye nchụaja a gaghị achọwa ajị na-acha edo edo. Onye ahụ rụrụ arụ.
37Ma ọ bụrụ nʼuche onye nchụaja na ọnya ahụ adịghị abasa abasa, ọ bụrụkwa na ajị ojii epupụtala nʼebe ahụ, ọnya ahụ alaala. Onye dị ọcha ka mmadụ ahụ bụ. Onye nchụaja ga-ekwupụta na ọ dị ọcha.
38“Mgbe nwoke maọbụ nwanyị ọbụla nwere ntụpọ ọcha nʼanụ ahụ ya,
39onye nchụaja ga-ele ya ahụ. Ọ bụrụ na ntụpọ ahụ adịghị achazi ezi ọcha, ọ bụ ọkọ nupụtara onye ahụ nʼahụ. Onye ahụ dị ọcha.