38“Mgbe nwoke maọbụ nwanyị ọbụla nwere ntụpọ ọcha nʼanụ ahụ ya,
39onye nchụaja ga-ele ya ahụ. Ọ bụrụ na ntụpọ ahụ adịghị achazi ezi ọcha, ọ bụ ọkọ nupụtara onye ahụ nʼahụ. Onye ahụ dị ọcha.
40“Mgbe ajị na-adịghịkwa nwoke nʼisi, ọ bụ isi nkwọcha, onye ahụ dị ọcha.
41Otu aka ahụ, ọ bụrụ na isi ya esite nʼegedege ihu ya kwọchasịa, ọ bụghị ekpenta, onye dị ọcha ka ọ bụ.
42Kama ọ bụrụ na onye ahụ enwee etuto nʼisi ya maọbụ nʼegedege ihu ya nke na-acha ọbara ọbara, na ọcha ọcha, o nwere ike bụrụ ọrịa ekpenta na-enupụta ya nʼisi maọbụ nʼegedege ihu.