40“Mgbe ajị na-adịghịkwa nwoke nʼisi, ọ bụ isi nkwọcha, onye ahụ dị ọcha.
41Otu aka ahụ, ọ bụrụ na isi ya esite nʼegedege ihu ya kwọchasịa, ọ bụghị ekpenta, onye dị ọcha ka ọ bụ.
42Kama ọ bụrụ na onye ahụ enwee etuto nʼisi ya maọbụ nʼegedege ihu ya nke na-acha ọbara ọbara, na ọcha ọcha, o nwere ike bụrụ ọrịa ekpenta na-enupụta ya nʼisi maọbụ nʼegedege ihu.
43Nʼihi ya, onye nchụaja ga-elezi ya anya. Ọ bụrụ na etuto ahụ toro ya nʼisi maọbụ nʼegedege ihu na-acha ọbara ọbara, na ọcha ọcha, ọ ga-abụ na ọ ghọọla ọrịa ekpenta.
44Onye nchụaja ga-agụ ya dịka onye ekpenta. Ọ bụkwa onye rụrụ arụ, nʼihi ọnya ahụ dị ya nʼisi.