43Nʼihi ya, onye nchụaja ga-elezi ya anya. Ọ bụrụ na etuto ahụ toro ya nʼisi maọbụ nʼegedege ihu na-acha ọbara ọbara, na ọcha ọcha, ọ ga-abụ na ọ ghọọla ọrịa ekpenta.
44Onye nchụaja ga-agụ ya dịka onye ekpenta. Ọ bụkwa onye rụrụ arụ, nʼihi ọnya ahụ dị ya nʼisi.
45“Onye ọbụla a chọpụtara na ọ bụ onye ekpenta ga-eyi uwe dọkara adọka, hapụ agịrị isi ya ka ọ dịka nke onye ara. Ọ ga-ekpuchi elu egbugbere ọnụ ya, na-eti mkpu na-asị, ‘Onye rụrụ arụ ka m bụ. Onye rụrụ arụ ka m bụ!’
46Ụbọchị niile nke ọ nọ nʼọrịa ahụ, ọ gaghị ebi nʼime obodo nʼetiti ụmụ mmadụ nʼihi na onye rụrụ arụ ka ọ bụ.
47“Ọ bụrụ na a hụrụ ntụpọ yiri ntụpọ ọrịa na-efe efe nʼuwe ajị anụ maọbụ nʼuwe ogho ọcha,