46Ụbọchị niile nke ọ nọ nʼọrịa ahụ, ọ gaghị ebi nʼime obodo nʼetiti ụmụ mmadụ nʼihi na onye rụrụ arụ ka ọ bụ.
47“Ọ bụrụ na a hụrụ ntụpọ yiri ntụpọ ọrịa na-efe efe nʼuwe ajị anụ maọbụ nʼuwe ogho ọcha,
48maọbụ nʼakpụkpọ anụ ọbụla, maọbụ nʼihe ọbụla e ji akpụkpọ ajị anụ maọbụ uwe ogho ọcha, uwe a kpara akpa, maọbụ nke a tụrụ atụ mee.
49Ọ bụrụkwa na ntụpọ dị nʼuwe ahụ, maọbụ nʼakpụkpọ anụ ahụ, maọbụ nke a kpara akpa, maọbụ nke atụrụ atụ, maọbụ nʼihe akpụkpọ anụ ọbụla na-acha ahịhịa ndụ maọbụ uhie uhie, o nwere ike ịbụ ọrịa na-efe efe. A ga-ewegara onye nchụaja uwe ahụ ka o lezie ya anya.
50Onye nchụaja ga-ele ya anya, were ya debe ya iche ụbọchị asaa.