47“Ọ bụrụ na a hụrụ ntụpọ yiri ntụpọ ọrịa na-efe efe nʼuwe ajị anụ maọbụ nʼuwe ogho ọcha,
48maọbụ nʼakpụkpọ anụ ọbụla, maọbụ nʼihe ọbụla e ji akpụkpọ ajị anụ maọbụ uwe ogho ọcha, uwe a kpara akpa, maọbụ nke a tụrụ atụ mee.
49Ọ bụrụkwa na ntụpọ dị nʼuwe ahụ, maọbụ nʼakpụkpọ anụ ahụ, maọbụ nke a kpara akpa, maọbụ nke atụrụ atụ, maọbụ nʼihe akpụkpọ anụ ọbụla na-acha ahịhịa ndụ maọbụ uhie uhie, o nwere ike ịbụ ọrịa na-efe efe. A ga-ewegara onye nchụaja uwe ahụ ka o lezie ya anya.
50Onye nchụaja ga-ele ya anya, were ya debe ya iche ụbọchị asaa.
51Nʼụbọchị nke asaa, onye nchụaja ga-ele ya anya ọzọ. Ọ bụrụ na ntụpọ ahụ agbasaa nʼuwe ahụ maọbụ nʼihe ahụ a kpara akpa, maọbụ nʼihe ahụ a tụrụ atụ, maọbụ nʼihe akpụkpọ anụ ahụ, nʼime ụbọchị asaa ndị a, nʼagbanyeghị ihe e ji ha eme, ọ bụ ọrịa ọjọọ na-efe efe. Ihe ahụ bụ ihe rụrụ arụ.