53“Ma ọ bụrụ na onye nchụaja ahụ ele hụ na ntụpọ ahụ agbasaghị nʼuwe ahụ, maọbụ nʼakwa ahụ a kpara akpa, maọbụ akwa a tụrụ atụ, maọbụ nʼihe akpụkpọ anụ ahụ ọbụla.
54Ọ ga-enye iwu ka a saa ihe ndị ahụ niile mmiri, wezugakwa ya iche ruo ụbọchị asaa ọzọ.
55Mgbe a sachara ihe ahụ mmiri, onye nchụaja ga-ele ya anya ọzọ. Ọ bụrụ na ntụpọ ahụ agbanwebeghị, ọ bụrụ na ọ na-achakwa dịka o si acha na mbụ, mgbe ụbọchị ndị a gasịrị, ọ bụ ezie na ọ gbasaghị, ọ bụ ihe rụrụ arụ. A ga-akpọ ya ọkụ, ma ntụpọ ahụ ọ dị nʼihu uwe ahụ maọbụ nʼazụ ya.
56Ma ọ bụrụ na onye nchụaja elee ya anya hụ na ụcha ntụpọ dị nʼihe ahụ adịghị ukwuu nʼihi nsacha a sachara ya na mmiri, ọ ga-achakapụ akụkụ uwe ahụ, maọbụ akwa ahụ a kpara akpa maọbụ nke a tụrụ atụ.
57Ọ bụrụ na ntụpọ ahụ emesịa pụta ọzọ nʼuwe ahụ, maọbụ nʼakwa ahụ a kpara akpa, maọbụ nke a tụrụ atụ, maọbụ nʼakpụkpọ anụ ahụ, o gosiri na ọ na-agbasa agbasa. Ihe ọbụla nwere ntụpọ ahụ ka a ga-akpọ ọkụ.