Levitikọs 13

Ọ ga-enye iwu ka a saa ihe ndị ahụ niile mmiri, wezugakwa ya iche ruo ụbọchị asaa ọzọ.

Leviticus 13:54 (UKJV) Then the priest shall command that they wash the thing wherein the plague is, and he shall shut it up seven days more:

52A ga-akpọ uwe ahụ, maọbụ akwa ajị anụ ahụ, maọbụ akwa ajị anụ a kpara akpa, maọbụ akwa ogho ọcha ahụ, maọbụ ihe akpụkpọ anụ ọbụla ọkụ, nʼihi na ọrịa na-efe efe dị nʼime ya, nʼihi na ọrịa na-eweta mbibi ka ọ bụ. A ghakwaghị iji ọkụ rechapụ ya.

53“Ma ọ bụrụ na onye nchụaja ahụ ele hụ na ntụpọ ahụ agbasaghị nʼuwe ahụ, maọbụ nʼakwa ahụ a kpara akpa, maọbụ akwa a tụrụ atụ, maọbụ nʼihe akpụkpọ anụ ahụ ọbụla.

54Ọ ga-enye iwu ka a saa ihe ndị ahụ niile mmiri, wezugakwa ya iche ruo ụbọchị asaa ọzọ.

55Mgbe a sachara ihe ahụ mmiri, onye nchụaja ga-ele ya anya ọzọ. Ọ bụrụ na ntụpọ ahụ agbanwebeghị, ọ bụrụ na ọ na-achakwa dịka o si acha na mbụ, mgbe ụbọchị ndị a gasịrị, ọ bụ ezie na ọ gbasaghị, ọ bụ ihe rụrụ arụ. A ga-akpọ ya ọkụ, ma ntụpọ ahụ ọ dị nʼihu uwe ahụ maọbụ nʼazụ ya.

56Ma ọ bụrụ na onye nchụaja elee ya anya hụ na ụcha ntụpọ dị nʼihe ahụ adịghị ukwuu nʼihi nsacha a sachara ya na mmiri, ọ ga-achakapụ akụkụ uwe ahụ, maọbụ akwa ahụ a kpara akpa maọbụ nke a tụrụ atụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.