1Onyenwe anyị gwara Mosis, sị,
2“Ndị a bụ usoro iwu gbasara onye ọrịa ekpenta nʼoge a na-eme mmemme ịdị ọcha ya, mgbe e dutere ya bịakwute onye nchụaja.
3Onye nchụaja ga-apụ gaa nʼazụ ebe obibi nọdụ nʼebe ahụ lee ya ahụ, ịchọpụta ma ọrịa ekpenta ya ọ laala nʼezie. Ọ bụrụ na ọrịa ya alaala,