Levitikọs 13

Ndị a bụ usoro iwu metụtara ntụpọ dịka ntụpọ ọrịa na-efe efe nke dị nʼuwe ajị anụ maọbụ uwe ogho ọcha, maọbụ nʼihe a kpara akpa maọbụ nʼihe a tụrụ atụ, maọbụ nʼihe akpụkpọ anụ. Iwu ndị a ga-enye aka ịchọpụta ma ha rụrụ arụ, maọbụ na ha dị ọcha.

Leviticus 13:59 (UKJV) This is the law of the plague of leprosy in a garment of woolen or linen, either in the warp, or woof, or any thing of skins, to pronounce it clean, or to pronounce it unclean.

57Ọ bụrụ na ntụpọ ahụ emesịa pụta ọzọ nʼuwe ahụ, maọbụ nʼakwa ahụ a kpara akpa, maọbụ nke a tụrụ atụ, maọbụ nʼakpụkpọ anụ ahụ, o gosiri na ọ na-agbasa agbasa. Ihe ọbụla nwere ntụpọ ahụ ka a ga-akpọ ọkụ.

58Uwe maọbụ ihe a kpara akpa, maọbụ ihe a tụrụ atụ, maọbụ ihe akpụkpọ anụ ọbụla a sara mmiri nke ntụpọ dị na ya pụrụ, a ga-asa ya mmiri ọzọ. Ọ ga-abụkwa ihe dị ọcha.”

59Ndị a bụ usoro iwu metụtara ntụpọ dịka ntụpọ ọrịa na-efe efe nke dị nʼuwe ajị anụ maọbụ uwe ogho ọcha, maọbụ nʼihe a kpara akpa maọbụ nʼihe a tụrụ atụ, maọbụ nʼihe akpụkpọ anụ. Iwu ndị a ga-enye aka ịchọpụta ma ha rụrụ arụ, maọbụ na ha dị ọcha.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.