9Nʼụbọchị nke asaa, ọ ga-akpụchapụ ntutu isi ya, na afụọnụ ya, na ikuanya ya, na ajị ndị ọzọ dị ya nʼahụ. Ọ ga-asa uwe ya na ahụ ya niile. Mgbe ahụ, a ga-agụ ya nʼonye dị ọcha.
10“Nʼụbọchị nke asatọ, ọ ga-ewere ebule abụọ na-enweghị ntụpọ, na otu nne atụrụ nke na-enweghị ntụpọ gbara otu afọ, ya na iri iko ọka a kwọrọ nke ọma a gwakọtara mmanụ oliv maka aja mkpụrụ ọka, na otu iko mmanụ.
11Onye nchụaja ahụ lere ya ahụ sị na ha dị ọcha, ga-ewere aja ndị a, ha na onye ahụ a na-aga ime ka ọ dị ọcha chee nʼihu Onyenwe anyị nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute.
12“Mgbe ahụ, onye nchụaja ahụ ga-ewere otu nʼime ụmụ ebule ahụ, na otu iko mmanụ chụọ ya dịka onyinye aja ikpe ọmụma. Ọ ga-efufe ha nʼihu Onyenwe anyị dịka aja mfufe.
13Ọ ga-egbu nwa ebule ahụ nʼakụkụ ebe nsọ ahụ, nʼebe a na-anọ egbu anụ aja mmehie na aja nsure ọkụ. Ọ bụ onye nchụaja ga-ewere anụ aja ikpe ọmụma a, dịka o were nke aja mmehie. Ọ bụ ihe dịkarịsịrị nsọ.