11Onye nchụaja ahụ lere ya ahụ sị na ha dị ọcha, ga-ewere aja ndị a, ha na onye ahụ a na-aga ime ka ọ dị ọcha chee nʼihu Onyenwe anyị nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute.
12“Mgbe ahụ, onye nchụaja ahụ ga-ewere otu nʼime ụmụ ebule ahụ, na otu iko mmanụ chụọ ya dịka onyinye aja ikpe ọmụma. Ọ ga-efufe ha nʼihu Onyenwe anyị dịka aja mfufe.
13Ọ ga-egbu nwa ebule ahụ nʼakụkụ ebe nsọ ahụ, nʼebe a na-anọ egbu anụ aja mmehie na aja nsure ọkụ. Ọ bụ onye nchụaja ga-ewere anụ aja ikpe ọmụma a, dịka o were nke aja mmehie. Ọ bụ ihe dịkarịsịrị nsọ.
14Onye nchụaja ahụ ga-ewere ụfọdụ nʼime ọbara aja ikpe ọmụma ahụ, tee nʼọnụ ntị aka nri nke onye ahụ a na-eme ka ọ dị ọcha. Ọ ga-etekwa ya nʼisi mkpụrụ aka nke aka nri ya, na nʼelu isi mkpụrụ ụkwụ nke ụkwụ aka nri ya.
15Emesịa onye nchụaja ga-awụnyetụ mmanụ oliv ahụ nʼọbụaka nke aka ekpe ya,