16ọ ga-arụnye otu mkpịsịaka nri ya nʼime mmanụ dị nʼọbụaka ya, ọ ga-ewere mkpịsịaka ya fesa ụfọdụ nʼime ya ugboro asaa nʼihu Onyenwe anyị.
17Onye nchụaja ga-ewere mmanụ ahụ fọdụrụ nʼọbụaka ya tee ya onye ahụ nʼọnụ ntị aka nri nke onye ahụ a na-aga ime ka ọ dị ọcha, na nʼisi mkpụrụ aka nke aka nri ya, na nʼisi mkpụrụ ụkwụ nke aka nri ya, nʼelu ọbara aja ikpe ọmụma ahụ mee.
18Ọ ga-ete mmanụ ahụ fọdụrụ nʼaka ya, nʼisi onye ahụ a na-eme ka ọ dị ọcha. Onye nchụaja ga-ekpuchikwara ha mmehie ya nʼihu Onyenwe anyị.
19“Mgbe ahụ, onye nchụaja ga-achụ aja mmehie, kpuchiere onye ahụ a ga-eme ka ọ dị ọcha site na-adịghị ọcha ha mmehie ya. Emesịa, onye nchụaja ga-egbu aja nsure ọkụ ahụ,
20were ya na onyinye mkpụrụ ọka chụọrọ onye ahụ aja, maka ikpuchiri ya mmehie ya. Mgbe ahụ, a ga-agụ onye ahụ nʼonye dị ọcha.