14Onye nchụaja ahụ ga-ewere ụfọdụ nʼime ọbara aja ikpe ọmụma ahụ, tee nʼọnụ ntị aka nri nke onye ahụ a na-eme ka ọ dị ọcha. Ọ ga-etekwa ya nʼisi mkpụrụ aka nke aka nri ya, na nʼelu isi mkpụrụ ụkwụ nke ụkwụ aka nri ya.
15Emesịa onye nchụaja ga-awụnyetụ mmanụ oliv ahụ nʼọbụaka nke aka ekpe ya,
16ọ ga-arụnye otu mkpịsịaka nri ya nʼime mmanụ dị nʼọbụaka ya, ọ ga-ewere mkpịsịaka ya fesa ụfọdụ nʼime ya ugboro asaa nʼihu Onyenwe anyị.
17Onye nchụaja ga-ewere mmanụ ahụ fọdụrụ nʼọbụaka ya tee ya onye ahụ nʼọnụ ntị aka nri nke onye ahụ a na-aga ime ka ọ dị ọcha, na nʼisi mkpụrụ aka nke aka nri ya, na nʼisi mkpụrụ ụkwụ nke aka nri ya, nʼelu ọbara aja ikpe ọmụma ahụ mee.
18Ọ ga-ete mmanụ ahụ fọdụrụ nʼaka ya, nʼisi onye ahụ a na-eme ka ọ dị ọcha. Onye nchụaja ga-ekpuchikwara ha mmehie ya nʼihu Onyenwe anyị.