21“Ọ bụrụ na ọ bụ ogbenye onye na-enweghị ike iweta ihe ndị a, ha aghaghị iwere otu nwa ebule dịka aja ikpe ọmụma nke a ga-efufe nʼihi aja ikpuchi mmehie ha, Ọ ga-ewetakwa iko ọka a kwọrọ nke ọma asaa maọbụ ihe ọtụtụ efaa a gwara mmanụ oliv dịka aja mkpụrụ ọka, ya na otu iko mmanụ.
22Ọ ga-ewetakwa nduru abụọ maọbụ kpalakwukwu abụọ, nke ọbụla o nwere ike iweta. Otu ga-abụ maka aja mmehie, nke ọzọ ga-abụ maka aja nsure ọkụ.
23“Ọ ga-ewere ha nye onye nchụaja nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute nʼihu Onyenwe anyị, nʼụbọchị nke asatọ ya, maka ime ka ha dị ọcha.
24Onye nchụaja ga-ewerekwa nwa atụrụ aja ikpe ọmụma ahụ, ya na otu iko mmanụ oliv ahụ, fufee ha nʼihu ebe ịchụ aja nye Onyenwe anyị.
25Ọ ga-egbu nwa atụrụ aja ikpe ọmụma ahụ, were ụfọdụ ọbara ya tee nʼọnụ ntị aka nri onye ahụ a na-aga ime ka ọ dị ọcha, na nʼisi mkpụrụ aka nke aka nri ya, na nʼisi mkpụrụ ụkwụ nke aka nri ya.