23“Ọ ga-ewere ha nye onye nchụaja nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute nʼihu Onyenwe anyị, nʼụbọchị nke asatọ ya, maka ime ka ha dị ọcha.
24Onye nchụaja ga-ewerekwa nwa atụrụ aja ikpe ọmụma ahụ, ya na otu iko mmanụ oliv ahụ, fufee ha nʼihu ebe ịchụ aja nye Onyenwe anyị.
25Ọ ga-egbu nwa atụrụ aja ikpe ọmụma ahụ, were ụfọdụ ọbara ya tee nʼọnụ ntị aka nri onye ahụ a na-aga ime ka ọ dị ọcha, na nʼisi mkpụrụ aka nke aka nri ya, na nʼisi mkpụrụ ụkwụ nke aka nri ya.
26Onye nchụaja ahụ ga-awụnye ụfọdụ mmanụ oliv ahụ nʼọbụaka nke aka ekpe ya,
27ọ ga-ewere mkpịsịaka nri ya fesa ụfọdụ mmanụ ahụ nke dị nʼọbụaka ya ugboro asaa nʼihu Onyenwe anyị.