26Onye nchụaja ahụ ga-awụnye ụfọdụ mmanụ oliv ahụ nʼọbụaka nke aka ekpe ya,
27ọ ga-ewere mkpịsịaka nri ya fesa ụfọdụ mmanụ ahụ nke dị nʼọbụaka ya ugboro asaa nʼihu Onyenwe anyị.
28Ọ ga-etekwa ụfọdụ mmanụ ahụ dị nʼaka ya nʼebe ndị ahụ o tere ọbara ikpe ọmụma ahụ, nke bụ nʼọnụ ntị onye ahụ nke a na-eme ka ọ dị ọcha, na nʼisi mkpụrụ aka nke aka nri ya, na nʼisi mkpụrụ ụkwụ nke aka nri ya.
29Mmanụ nke fọdụrụ nʼaka ya ka onye nchụaja ga-ete nʼisi onye ahụ a na-eme ka ọ dị ọcha, ikpuchi mmehie ha nʼihu Onyenwe anyị.
30Emesịa, ọ ga-eji nduru abụọ ahụ maọbụ kpalakwukwu abụọ ahụ, nke ọbụla o nwere ike iweta, chụọ aja.