29Mmanụ nke fọdụrụ nʼaka ya ka onye nchụaja ga-ete nʼisi onye ahụ a na-eme ka ọ dị ọcha, ikpuchi mmehie ha nʼihu Onyenwe anyị.
30Emesịa, ọ ga-eji nduru abụọ ahụ maọbụ kpalakwukwu abụọ ahụ, nke ọbụla o nwere ike iweta, chụọ aja.
31Otu ga-abụ maka aja mmehie, nke ọzọ ga-abụ maka aja nsure ọkụ, ha na aja mkpụrụ ọka. Nʼụzọ dị otu a, onye nchụaja ga-ekpuchiri ya mmehie ya nʼihu Onyenwe anyị, bụ onye ahụ a na-eme ka ọ dị ọcha.”
32Ndị a bụ usoro iwu dịrị onye ọbụla e sitere nʼọrịa ekpenta mee ka ọ dị ọcha, onye aka ya na-erughị iweta ihe o kwesiri iweta, bụ nke e ji eme ka ọ dị ọcha.
33Onyenwe anyị gwara Mosis na Erọn okwu sị,