36Onye nchụaja ahụ ga-enye iwu ka a kwapụsịa ihe niile dị nʼụlọ ahụ tupu ọ gaa lezie ụlọ ahụ anya, ka ihe niile dị nʼụlọ ahụ ghara ịbụ ihe rụrụ arụ, ma ọ bụrụ na achọpụta ọrịa na-efe efe nʼụlọ ahụ. Mgbe a kwapụtasịrị ihe dị nʼụlọ ahụ, onye nchụaja ga-aga lee ụlọ ahụ.
37Ọ ga-ele ntụpọ dị nʼahụ ụlọ ahụ. Ọ bụrụ na ntụpọ ahụ na-acha ahịhịa ndụ ahịhịa ndụ, maọbụ ọbara ọbara, ọ bụrụkwa na ha miri emi karịa aja ụlọ ahụ nʼile anya,
38onye nchụaja ga-esi nʼọnụ ụzọ ụlọ ahụ pụọ, kpọchie ụlọ ahụ ụbọchị asaa.
39Nʼụbọchị nke asaa, onye nchụaja ga-alọghachi bịa lee ụlọ ahụ ọzọ. Ọ bụrụ na ntụpọ ahụ agbasaala nʼaja ụlọ ahụ,
40onye nchụaja ga-enye iwu ka e tida akụkụ aja ụlọ ahụ bufuo ya nʼebe a na-ekpofu ihe rụrụ arụ nʼazụ obodo.