Levitikọs 14

onye nchụaja ga-enye iwu ka e tida akụkụ aja ụlọ ahụ bufuo ya nʼebe a na-ekpofu ihe rụrụ arụ nʼazụ obodo.

Leviticus 14:40 (UKJV) Then the priest shall command that they take away the stones in which the plague is, and they shall cast them into an unclean place without the city:

38onye nchụaja ga-esi nʼọnụ ụzọ ụlọ ahụ pụọ, kpọchie ụlọ ahụ ụbọchị asaa.

39Nʼụbọchị nke asaa, onye nchụaja ga-alọghachi bịa lee ụlọ ahụ ọzọ. Ọ bụrụ na ntụpọ ahụ agbasaala nʼaja ụlọ ahụ,

40onye nchụaja ga-enye iwu ka e tida akụkụ aja ụlọ ahụ bufuo ya nʼebe a na-ekpofu ihe rụrụ arụ nʼazụ obodo.

41Ọ ga-enyekwa iwu ka a kpụchaa aja ụlọ niile dị nʼime ụlọ ahụ, bufukwaa aja niile a kpụchapụtara nʼebe a na-ekpofu ihe rụrụ arụ nʼazụ obodo.

42A ga-ebute nkume ọzọ jiri ha dochie ndị ahụ e bupụsịrị. A ga-ejikwa ụrọ ọhụrụ tee ụlọ ahụ ọzọ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.