Levitikọs 14

A ga-ebute nkume ọzọ jiri ha dochie ndị ahụ e bupụsịrị. A ga-ejikwa ụrọ ọhụrụ tee ụlọ ahụ ọzọ.

Leviticus 14:42 (UKJV) And they shall take other stones, and put them in the place of those stones; and he shall take other mortar, and shall daubed the house.

40onye nchụaja ga-enye iwu ka e tida akụkụ aja ụlọ ahụ bufuo ya nʼebe a na-ekpofu ihe rụrụ arụ nʼazụ obodo.

41Ọ ga-enyekwa iwu ka a kpụchaa aja ụlọ niile dị nʼime ụlọ ahụ, bufukwaa aja niile a kpụchapụtara nʼebe a na-ekpofu ihe rụrụ arụ nʼazụ obodo.

42A ga-ebute nkume ọzọ jiri ha dochie ndị ahụ e bupụsịrị. A ga-ejikwa ụrọ ọhụrụ tee ụlọ ahụ ọzọ.

43“Ma ọ bụrụ na ntụpọ ahụ apụta ọzọ, mgbe e bupụsịrị nkume ndị ahụ, ma mgbe a kpuchasịrị aja ụlọ ma techikwaa ya,

44onye nchụaja ga-abịa lee ya. Ọ bụrụ na ọ hụ na ntụpọ ahụ agbasaala ọzọ, ọ ga-agụ ụlọ ahụ dịka ihe rụrụ arụ, nʼihi na ntụpọ ahụ bụ ọrịa na-efe efe.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.