8“ ‘Onye ọbụla dị ọcha nke onye ahụ bụsara ọnụ mmiri ga-abụ onye rụrụ arụ ruo uhuruchi. Ọ ga-asa uwe ya na ahụ ya mmiri.
9“ ‘Ihe ọbụla onye ahụ ji anọkwasị nʼelu anụmanụ ọ na-agba ga-abụ ihe rụrụ arụ.
10Onye ọbụla ga-eburu, maọbụ metụ ihe ọbụla o ji nọdụ ala aka ga-abụ onye rụrụ arụ ruo uhuruchi. Ọ ga-asa uwe ya na ahụ ya mmiri.
11“ ‘Ọ bụrụ na nwoke ahụ rụrụ arụ ebughị ụzọ saa aka ya tupu o metụ mmadụ aka, onye ahụ o metụrụ aka ga-abụ onye rụrụ arụ ruo uhuruchi. Ọ ga-asa uwe ya na ahụ ya mmiri.
12“ ‘A ga-etiwa ite aja ọbụla onye ahụ metụrụ aka, jiri mmiri ṅachaa ihe osisi ọbụla o metụrụ aka.