6Onye ọbụla nọdụrụ ala nʼihe onye ahụ nọdụrụ ala nʼoge ahụ ọ bụ onye rụrụ arụ, ga-abụ onye rụrụ arụ ruo uhuruchi. Ọ ga-asa uwe ya, na ahụ ya mmiri.
7“ ‘Onye ọbụla metụrụ nwoke ahụ ihe si nʼahụ ya na-asọpụta aka ga-asa uwe ya na ahụ ya mmiri, bụrụ onye rụrụ arụ ruo uhuruchi.
8“ ‘Onye ọbụla dị ọcha nke onye ahụ bụsara ọnụ mmiri ga-abụ onye rụrụ arụ ruo uhuruchi. Ọ ga-asa uwe ya na ahụ ya mmiri.
9“ ‘Ihe ọbụla onye ahụ ji anọkwasị nʼelu anụmanụ ọ na-agba ga-abụ ihe rụrụ arụ.
10Onye ọbụla ga-eburu, maọbụ metụ ihe ọbụla o ji nọdụ ala aka ga-abụ onye rụrụ arụ ruo uhuruchi. Ọ ga-asa uwe ya na ahụ ya mmiri.