16“ ‘Nwoke ọbụla mkpụrụ nwa ya si ya nʼamụ pụọ, ga-asa ahụ ya nke ọma, bụrụ onye rụrụ arụ ruo uhuruchi.
17A ga-asacha ihe ọbụla mkpụrụ nwa ahụ metụrụ, maọbụ akwa maọbụ akpụkpọ anụ. Ha ga-abụ ihe rụrụ arụ ruo uhuruchi.
18Mgbe nwoke na nwanyị dinakọrọ, ma nwoke ahụ anyụpụta mkpụrụ nwa, ha abụọ ga-asa ahụ ha nke ọma, bụrụ ndị rụrụ arụ ruo uhuruchi.
19“ ‘Mgbe ọbara si nwanyị nʼahụ pụọ dịka o kwesiri nʼoge a kara aka nʼọnwa ọbụla, nwanyị ahụ ga-abụ onye rụrụ arụ ụbọchị asaa. Onye ọbụla metụrụ ya aka nʼoge a ga-abụ onye rụrụ arụ ruo uhuruchi.
20“ ‘Ihe ọbụla o dinara nʼelu ya nʼoge a, maọbụ ihe ọ nọkwasịrị nʼelu ya ga-arụ arụ.