19“ ‘Mgbe ọbara si nwanyị nʼahụ pụọ dịka o kwesiri nʼoge a kara aka nʼọnwa ọbụla, nwanyị ahụ ga-abụ onye rụrụ arụ ụbọchị asaa. Onye ọbụla metụrụ ya aka nʼoge a ga-abụ onye rụrụ arụ ruo uhuruchi.
20“ ‘Ihe ọbụla o dinara nʼelu ya nʼoge a, maọbụ ihe ọ nọkwasịrị nʼelu ya ga-arụ arụ.
21Onye ọbụla metụrụ ihe ndina ya aka, ga-asa uwe ya na ahụ ya. Ọ ga-abụ onye rụrụ arụ ruo uhuruchi.
22Onye metụrụ ihe o ji nọdụ ala aka ga-asa uwe ya na ahụ ya. Ọ ga-abụ onye rụrụ arụ ruo uhuruchi.
23Ọ bụrụkwa na ọ bụ ihe ndina ya, maọbụ ihe ọzọ nke o ji nọdụ ala, onye ọbụla metụrụ ya aka ga-abụ onye rụrụ arụ ruo uhuruchi.