9Mkpi ahụ nza mara ga-abụ nke Onyenwe anyị, ya ka Erọn ga-egbu dịka aja mmehie.
10Ma mkpi ahụ nke nza mara dịka ewu na-ewere ọnọdụ iburu mmehie ka a ga-eche na ndụ nʼihu Onyenwe anyị, nʼihi iji ya mee mmemme mkpuchi mmehie, a ga-ahapụ ya ka o buru mmehie niile kpafuo nʼọzara.
11“Erọn ga-eweta oke ehi maka aja mmehie nke ya onwe ya, iji kpuchie mmehie ya na nke ezinaụlọ ya. Ọ ga-egbu oke ehi ahụ maka aja mmehie nke ya onwe ya.
12Ọ ga-esite nʼebe ịchụ aja dị nʼihu Onyenwe anyị were ihe ịgụ ọkụ jupụtara nʼicheku ọkụ. Ọ ga-ewerekwa ụda na-esi isi ụtọ ruru mkpoju aka abụọ, were ha bata nʼime akụkụ nke ọzọ nke akwa mgbochi ahụ.
13Nʼebe ahụ ọ ga-awụnye ụda ndị ahụ na-esi isi ụtọ nʼelu icheku ọkụ ahụ nʼihu Onyenwe anyị, ka anwụrụ ọkụ nke ụda ndị a kpuchie ebe mkpuchi mmehie ahụ dị nʼelu Ihe Ama ahụ ka ọ ghara ịnwụ.