13Nʼebe ahụ ọ ga-awụnye ụda ndị ahụ na-esi isi ụtọ nʼelu icheku ọkụ ahụ nʼihu Onyenwe anyị, ka anwụrụ ọkụ nke ụda ndị a kpuchie ebe mkpuchi mmehie ahụ dị nʼelu Ihe Ama ahụ ka ọ ghara ịnwụ.
14Ọ ga-ewebatakwa ụfọdụ ọbara oke ehi ahụ, jiri mkpịsịaka ya fesa ya nʼihu ebe mkpuchi mmehie ahụ, nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ, fesakwa ya ugboro asaa nʼihu ebe mkpuchi mmehie ahụ.
15“Emesịa, ọ ga-esi nʼebe ahụ pụọ gaa gbuo mkpi aja mmehie ụmụ Izrel, werekwa ọbara ya bata nʼazụ akwa mgbochi fesa ya nʼelu ebe mkpuchi mmehie ahụ, na nʼihu ya, dịka o jiri ọbara nwa oke ehi ahụ mee.
16Nʼụzọ dị otu a, ọ ga-ekpuchiri Ebe ahụ Kachasị Nsọ mmehie ya, nʼihi mmehie na nnupu isi ụmụ Izrel, ihe ọbụla mmehie ndị ahụ bụ. Ọ ga-achụkwa ụdị aja a nʼihi ụlọ nzute ahụ, nʼihi na ọ dị nʼetiti ebe obibi rụrụ arụ nke ụmụ Izrel.
17O nweghị onye ọbụla ọzọ ga-anọ nʼime ụlọ nzute ahụ, site nʼoge Erọn banyere nʼEbe ahụ Kachasị Nsọ ịchụ aja mkpuchi mmehie tutu ruo mgbe ọ pụtara, mgbe ọ chụchara aja mkpuchi mmehie maka onwe ya na ezinaụlọ ya, na maka ụmụ Izrel niile.