15“Emesịa, ọ ga-esi nʼebe ahụ pụọ gaa gbuo mkpi aja mmehie ụmụ Izrel, werekwa ọbara ya bata nʼazụ akwa mgbochi fesa ya nʼelu ebe mkpuchi mmehie ahụ, na nʼihu ya, dịka o jiri ọbara nwa oke ehi ahụ mee.
16Nʼụzọ dị otu a, ọ ga-ekpuchiri Ebe ahụ Kachasị Nsọ mmehie ya, nʼihi mmehie na nnupu isi ụmụ Izrel, ihe ọbụla mmehie ndị ahụ bụ. Ọ ga-achụkwa ụdị aja a nʼihi ụlọ nzute ahụ, nʼihi na ọ dị nʼetiti ebe obibi rụrụ arụ nke ụmụ Izrel.
17O nweghị onye ọbụla ọzọ ga-anọ nʼime ụlọ nzute ahụ, site nʼoge Erọn banyere nʼEbe ahụ Kachasị Nsọ ịchụ aja mkpuchi mmehie tutu ruo mgbe ọ pụtara, mgbe ọ chụchara aja mkpuchi mmehie maka onwe ya na ezinaụlọ ya, na maka ụmụ Izrel niile.
18“Mgbe o si nʼebe ahụ pụta, gaa nʼebe ịchụ aja dị nʼihu Onyenwe anyị kpuchiere ya mmehie ya. Ọ ga-ewere ụfọdụ ọbara nwa oke ehi ahụ na nke mkpi ahụ tee ya na mpi niile dị nʼebe ịchụ aja ahụ.
19Ọ ga-eji mkpịsịaka ya fesa ụfọdụ ọbara ahụ nʼelu ebe ịchụ aja ahụ ugboro asaa iji hichapụ adịghị ọcha ya nʼihi ịrụ arụ ụmụ Izrel, na ido ya nsọ.